Abụ Ọma 34

Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,

Psalm 34:12 (UKJV) What man is he that desires life, and loves many days, that he may see good?

10Agụụ nwere ike ịgụ ụmụ ọdụm, ike pụkwara ịgwụ ha, ma ihe ọbụla bụ ihe ọma agaghị akọ ndị niile na-achọ Onyenwe anyị.

11Ụmụ m, bịanụ gee m ntị; aga m ezi unu ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ.

12Onye ọbụla nʼime unu hụrụ ndụ nʼanya, ma nwee ọchịchọ ihu ọtụtụ ụbọchị ndị dị mma,

13chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ, chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha.

14Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe, chọọ udo ma gbasookwa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.