4Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.
5Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.
6Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri;
7ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.
8Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. Sela