15Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha.
16Ma akpọkuru m Chineke, Onyenwe anyị na-azọpụtakwa m.
17Nʼụtụtụ, ma nʼehihie, ma nʼabalị, ka m sitere nʼoke ihe mgbu, na-akpọku ya ma ọ na-anụkwa olu m.
18Ọ na-agbapụta m, mee ka m ghara imerụ ahụ, site nʼagha niile e busoro m, nʼagbanyeghị nʼọtụtụ biliri megide m.
19Chineke, onye nọkwasịrị nʼocheeze ya ruo mgbe ebighị ebi, onye na-adịghị agbanwe, ga-anụ olu ha, taakwa ha ahụhụ, nʼihi na ha adịghị atụ egwu Chineke. Sela