1O Chineke, nụrụ ekpere m, agbakwala arịrịọ m nkịtị;
2ṅaa m ntị, zaakwa m. Echiche m na-esogbu m; ana m asụkwa oke ude
3nʼihi ihe onye iro m na-ekwu, nʼihi ịba mba nke ndị ajọ mmadụ, nʼihi na ha na-ewetara m ntaramahụhụ, na-akpagbu m nʼiwe ha.
4Obi m nọ nʼọnọdụ oke ihe mgbu nʼime m; oke ụjọ nke ọnwụ abịakwasịla m.