16Gị ugwu nwere ọtụtụ ugwu, gịnị mere i ji ele anya site nʼekworo nʼugwu Chineke họọrọ ị bụ ebe ọ ga-anọ chịa, ebe Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-ebi, ruo ebighị ebi?
17Ọnụọgụgụ ụgbọ agha Chineke dị iri puku kwụrụ puku, a pụghị ịgụta ha; ha dịkwa puku kwụrụ puku; Onyenwe anyị sitere Saịnaị bata nʼụlọnsọ ya.
18Mgbe i rigoro gaa nʼelu, i duuru ndị a dọtara nʼagha; ị natara onyinye dị iche iche nʼaka ndị mmadụ, ọ bụladị nʼaka ndị na-enupu isi, ka gị, O Onyenwe anyị Chineke, biri nʼebe ahụ.
19Otuto dịrị Onyenwe anyị, Chineke anyị, na Onye Nzọpụta anyị, Onye na-ebu ibu arọ anyị ụbọchị niile. Sela
20Chineke anyị bụ Chineke na-azọpụta; mgbapụta pụọ nʼọnwụ na-esite nʼaka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.