5Ọ bụ nna ndị nke na-enweghị nna, onye na-ekpechitere ndị di ha nwụrụ anwụ ọnụ ha, onye a bụ Chineke, onye bi nʼebe ya dị nsọ.
6Chineke na-eme ka ndị naanị ha nọ nwee ezinaụlọ, ọ na-eji ịbụ abụ dupụta ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ, ma ndị nnupu isi ka ọ na-eme ka ha biri, nʼala kpọrọ nkụ.
7Mgbe i buteere ndị gị ụzọ, O Chineke, mgbe i gabigara nʼala tọgbọrọ nʼefu, Sela
8elu ụwa mara jijiji, eluigwe wụpụrụ mmiri ozuzo, nʼihu Chineke, Onye Saịnaị, nʼihu Chineke, Chineke nke Izrel.
9I nyere mmiri ozuzo nʼebe ọ dị ukwuu, O Chineke, i tutere ihe nketa gị nke ike gwụrụ.