Abụ Ọma 69

Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.

Psalm 69:11 (UKJV) I made sackcloth also my garment; and I became a proverb to them.

9Nʼihi na ihe gbasara ụlọ gị na-anụ m ọkụ nʼobi, ịta ụta niile nke ndị na-akparị gị adakwasịla m.

10Mgbe m na-ebe akwa na-ebukwa ọnụ, ha kparịrị m nʼihi na m na-eme nke a.

11Mgbe m yikwasịrị uwe iru ụjụ m, a ghọrọ m ihe ha ji eme ihe ọchị.

12Ndị na-anọ ọnọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama, na-akwa m emo, na-akọ m ọnụ, abụ m isi abụ nke ndị na-aṅụbiga mmanya oke na-abụ.

13O Onyenwe anyị, ana m akpọku gị nʼekpere, nʼoge ihuọma gị; na oke ịhụnanya gị, O Chineke m, zaa m nʼeziokwu nke nzọpụta gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.