13Nʼezie, ọ bụ naanị nʼefu ka m debere obi m ọcha, nʼefu ka m kwọrọ aka m abụọ nʼemeghị ihe ọjọọ.
14Ogologo ụbọchị niile, anọ m na nsogbu; ụtụtụ niile ka m na-anata ntaramahụhụ.
15Ọ bụrụ na m kwuru sị, “Nke a ka m ga-ekwu,” agaara m abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼetiti ụmụ gị.
16Mgbe m gbalịrị ịghọta ihe ndị a niile, ọ ghọọrọ m ihe mwute,
17tutu ruo mgbe m bara nʼebe nsọ Chineke; mgbe ahụ ka m ghọtara ihe ga-eme ha nʼikpeazụ.