25Onye ka m nwere nʼeluigwe ma ọ bụghị gị? Ọ dịghị ihe ụwa a nwere nke m ga-achọsi ike karịa gị.
26Anụ ahụ m na mkpụrụobi m nwere ike ịda mba, ma Chineke bụ ike nke obi m, na ihe nketa m ruo ebighị ebi.
27Ndị niile nọpụrụ gị nʼebe dị anya ga-ala nʼiyi. Ị ga-alakwa ndị niile na-ekwesighị ntụkwasị obi, nye gị nʼiyi.
28Ma nye mụ onwe m, ọ dị mma ịnọ Chineke nso. Emeela m Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ebe mgbaba m. Aga m akọ banyere ọrụ gị niile dị iche iche.