3O ji oke olu, nke dara ụda dịka ịgbọ ụja ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ.
4Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nʼeluigwe na-ekwu, “Edela ihe ahụ nʼakwụkwọ, nʼihi na-achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.”
5Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ nke m hụrụ zọkwasịrị ụkwụ ya nʼelu osimiri, na nʼala akọrọ ahụ, chịlịri aka ya abụọ elu,
6were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla.
7Nʼụbọchị ahụ, mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ ga-afụ opi ike ha, ihe omimi niile nke Chineke ga-emezu, dịka ọ gwara ndị ohu ya bụ ndị amụma.