Mkpughe 11

Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke,

Revelation 11:16 (UKJV) And the four and twenty elders, which sat before God on their seats, fell upon their faces, and worshipped God,

14Ugbu a ahụhụ nke abụọ ahụ agafeela. Ma mgbe na-adịghị anya, ahụhụ nke atọ na-abịa.

15Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”

16Mgbe ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ nọ nʼocheeze ndị ahụ dị nʼihu ocheeze Chineke dara nʼala kpọọ isiala nye Chineke,

17na-asị, “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Onye na-adị, na onye dịkwaarị, nʼihi na i werela oke ike gị niile nʼaka gị malitekwa ịchị ọchịchị.

18Mba niile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe na ịkwụghachi ndị ohu gị bụ ndị amụma ụgwọ ọrụ ha, na ndị nsọ na ndị gị niile, bụ ndị na-atụ egwu aha gị, bụ ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nʼiyi ndị na-emebi ụwa ga-adị.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.