15Ma agwọ ahụ meghere ọnụ ya mee ka mmiri si nʼọnụ ya sọpụta dịka iyi nke ga-ebufu nwanyị ahụ.
16Ma ala nyeere nwanyị ahụ aka. O meghere ọnụ ya loda idee mmiri a nke si nʼọnụ agwọ ahụ sọpụta.
17Mgbe ahụ, agwọ ochie ahụ wesara nwanyị ahụ iwe, pụọ ịga buo agha megide ụmụ ya bụ ndị niile fọdụrụ, bụ ndị niile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị ama nke Jisọs.