Mkpughe 12

Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa.

Revelation 12:2 (UKJV) And she being with child cried, travailing in birth, and pained to be delivered.

1Oke ihe ịrịbama pụtara ihe nʼeluigwe, otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dịka uwe. Ọnwa dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpueze nwee kpakpando iri na abụọ dịkwa ya nʼisi.

2Ọ dị ime, na-etikwa mkpu nʼihi ahụhụ na ihe ụfụ nke ọmụmụ nwa.

3Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya.

4O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.