Mkpughe 12

Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya.

Revelation 12:5 (UKJV) And she brought forth a male child, who was to rule all nations with a rod of iron: and her child was caught up unto God, and to his throne.

3Mgbe ahụ, ihe ama ọzọ pụtara ihe nʼeluigwe, agwọ ochie nke dị ukwuu na-acha uhie uhie a na-akpọ dragọn, nke nwere isi asaa na mpi iri. O kpukwasịkwara okpueze asaa nʼisi ya.

4O nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke kpakpando niile dị nʼeluigwe, tụda ha nʼala. Ọ bịara guzo nʼihu nwanyị ahụ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ ma a mụpụta ya.

5Ọ mụpụtara nwantakịrị nwoke, “onye ga-ejikwa mkpara ọchịchị chịa mba niile ọchịchị.” Nʼotu oge ahụ kwa, e si nʼebe ahụ wepụ nwata ahụ were ya gaa nʼebe Chineke nọ nʼeluigwe nʼocheeze ya.

6Ma nwanyị ahụ si nʼebe ahụ gbapụ gbalaa nʼọzara ebe Chineke kwadebere na ọ ga-anọ. Ebe ahụ ka a ga-elekọta ya anya nke ọma otu puku ụbọchị na narị ụbọchị abụọ na iri ụbọchị isii (1,260).

7Mgbe ahụ, agha dapụtara nʼeluigwe. Maikel na ndị mmụọ ozi ya buru agha megide agwọ ochie ahụ (a na-akpọ dragọn). Dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha nke ha,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.