5E nyekwara anụ ọhịa ahụ ọnụ na ike ikwu okwu mpako na ikike ikwulu ekwulu ọnwa iri anọ na abụọ.
6O meghere ọnụ ya malite ikwulu Chineke, na aha ya na ebe obibi ya, na ndụ ahụ bụ ndị bi nʼeluigwe.
7E nyere ya ike ibuso ndị nsọ agha na imeri ha. E nyekwara ya ikike ịchị agbụrụ niile, na ebo niile, na ndị niile, na mba niile na asụsụ niile.
8Ndị niile bi nʼelu ụwa ga-akpọkwa isiala nye ya, bụ onye ọbụla a na-edeghị aha ya nʼime akwụkwọ nke ndụ nke Nwa atụrụ ahụ e gbururị, site nʼoge e kere ụwa.
9Onye nwere ntị ya nụrụ.