Mkpughe 14

Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.

Revelation 14:19 (UKJV) And the angel thrust in his sickle into the earth, and gathered the vine of the earth, and cast it into the great winepress of the wrath of God.

17Mmụọ ozi ọzọ sitekwara nʼụlọnsọ ukwu dị nʼeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.

18Mmụọ ozi ọzọ, nke na-elekọta ọkụ sitekwara nʼebe ịchụ aja ahụ pụta, were olu ike gwa mmụọ ozi ahụ ji mma dị nkọ sị, “Were mma owuwe ihe ubi gị dị nkọ bipụ osisi ụyọkọ mkpụrụ grepu site na vaịnị niile dị nʼụwa, nʼihi na ha niile achaala.”

19Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nʼụwa, bipụsịa ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ahụ chịkọta ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.

20A zọchakwara mkpụrụ vaịnị ahụ nʼebe a na-azọcha mkpụrụ vaịnị nke dị nʼazụ obodo. Ọbara si nʼebe ahụ gbapụta dị elu ruo ihe dịka eriri e ji ekegide ịnyịnya nʼisi ime ka ọ gaa ebe achọrọ, ọ bụ ihe ruru narị kilomita atọ nʼogologo.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.