Mkpughe 16

Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.”

Revelation 16:1 (UKJV) And I heard a great voice out of the temple saying to the seven angels, Go your ways, and pour out the vials of the wrath of God upon the earth.

1Mgbe ahụ, anụrụ m oke olu si nʼụlọnsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nʼefere ọnụma asaa Chineke ahụ nʼelu ụwa.”

2Mmụọ ozi nke mbụ pụrụ gaa wụsa ihe dị nʼefere nke ya nʼelu ụwa, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị mmadụ niile nwere akara anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọrọ oyiyi ya isiala.

3Mmụọ ozi nke abụọ wụsara ihe dị nʼime efere nke ya nʼelu osimiri niile. Otu mgbe ahụ, osimiri niile chagharịrị ghọọ ọbara dịka nke onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe niile dị ndụ nʼime osimiri ahụ nwụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.