Mkpughe 16

Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ.

Revelation 16:13 (UKJV) And I saw three unclean spirits like frogs come out of the mouth of the dragon, and out of the mouth of the beast, and out of the mouth of the false prophet.

11Ha kọchara Chineke nke eluigwe nʼihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nʼajọ ọrụ ha niile.

12Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nʼefere ya nʼelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nʼime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị ndị eze ahụ si nʼọwụwa anyanwụ mfe.

13Ahụrụ mmụọ atọ rụrụ arụ ndị pụtara ihe nʼụdịdị awọ, ha si nʼọnụ agwọ ochie ahụ na nʼọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta, na nʼọnụ onye amụma ụgha ahụ.

14Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịbama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa niile ịchịkọta ha maka ibu agha nʼụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile.

15“Lee! Ana m abịa dịka onye ohi. Ngọzị na-adịrị onye ahụ nọ na-eche nche, ndị yi uwe ha na njikere, ka ọ ghara ijegharị nʼọnọdụ ịgba ọtọ, bụrụ onye ọnọdụ ya na-eweta ihere.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.