16Anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwanyị akwụna ahụ asị. Ha ga-agba ya ọtọ, laakwa ya nʼiyi, ha ga-eri anụ ya, werekwa ọkụ rechapụ ya.
17Chineke etinyela ya nʼobi ha imejupụta nzube ya site nʼinwe otu obi nakwa inyefe anụ ọhịa ahụ ikike ọchịchị alaeze ha, tutu ruo mgbe a ga-emezu okwu Chineke.
18Ma nwanyị a ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze niile nke ụwa.”