Mkpughe 18

“Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ.

Revelation 18:11 (UKJV) And the merchants of the earth shall weep and mourn over her; for no man buys their merchandise any more:

9“Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya.

10Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị, “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha ya gị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara. Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’

11“Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ.

12Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl.

13Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.