Mkpughe 2

“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ.

Revelation 2:1 (UKJV) Unto the angel of the church of Ephesus write; These things says he that holds the seven stars in his right hand, who walks in the midst of the seven golden candlesticks;

1“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nʼEfesọs, sị ya: Ihe ndị a bụ okwu si nʼọnụ onye ahụ na-ejide kpakpando asaa nʼaka ya, ma na-ejegharịkwa nʼetiti ihe ịdọba oriọna ọlaedo asaa ndị ahụ.

2Amaara m ihe niile banyere ọrụ gị niile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachiobi gị. Amaara m na ị dịghị anagide ndị ajọ omume, na ị nwaleela ndị ahụ niile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nʼezie, chọpụtakwa na ha bụ ndị ụgha.

3I jirila ntachiobi nagide nhụju anya nʼihi aha m, ma ike agwụghị gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.