22Lee, aga m etinye ya nʼute ahụhụ, meekwa ka ndị ya na ha na-akwa iko taa ahụhụ dị ukwuu. Ọ bụ naanị ma ha chegharịrị ka ihe ndị a na-agaghị abịakwasị ha.
23Ma nʼebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ niile ga-amata na abụ m onye na-enyocha mmụọ na mkpụrụobi niile. Aga m akwụghachikwa onye ọbụla nʼime unu ụgwọ ọrụ kwesiri ọrụ ya.
24Ugbu a, ana m agwa unu ndị fọdụrụ na Tiatira, unu ndị na-agbasoghị ozizi ya, ndị na-amụtabekwaghị ihe ndị ahụ ekwensu kpọrọ ihe nzuzo dị omimi, ‘O nweghị ibu arọ ọzọ m ga-ebokwasị unu,
25ma ọ bụghị, unu jidesienụ ihe unu nwere aka ike tutu ruo mgbe m ga-abịa.’
26Ma onye ọbụla na-emeri emeri, na-anọgidekwa na-eme uche m ruo ọgwụgwụ ihe niile, ka m ga-enye ikike nʼebe mba niile nọ.