13Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị.
14Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ.
15Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ.