Mkpughe 20

Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.

Revelation 20:3 (UKJV) And cast him into the bottomless pit, and shut him up, and set a seal upon him, that he should deceive the nations no more, till the thousand years should be fulfilled: and after that he must be loosed a little season.

1Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya.

2O jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ, onye bụ Ekwensu na Setan, kee ya agbụ otu puku afọ.

3Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge.

4Mgbe ahụ, ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nʼelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụobi ndị ahụ e bepụrụ isi nʼihi na ha gbaara Jisọs akaebe, kwusakwa okwu Chineke. Ha akpọbeghị isiala nye anụ ọhịa ahụ maọbụ ihe oyiyi ya. Ha enweghị akara anụ ọhịa ahụ nʼegedege ihu ha, maọbụ nʼaka ha. Ha dịkwa ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst chịa otu puku afọ.

5Nke a bụ mbilite nʼọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nʼetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nʼọnwụ tutu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.