16Nʼobodo ahụ, enweghị otu akụkụ nʼime akụkụ anọ nke mgbidi ya karịrị ibe ya. Ogologo ya na obodobo ya ha otu. O ji ihe ọtụtụ tụọ ya, ogologo ya na obodobo nakwa ịdị elu ya ha, ọtụtụ ya dị puku kilomita abụọ na narị kilomita abụọ.
17Ọ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ, dịka ihe ọtụtụ nke mmụọ ozi ahụ si gụpụta.
18Ihe e ji rụọ mgbidi ya bụ nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa, jiri ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwu dịka enyo dị ọcha rụọ obodo ahụ.
19E ji nkume niile dị oke ọnụahịa chọọ ntọala mgbidi obodo ahụ mma. Ntọala nke mbụ, bụ nkume a na-akpọ jaspa, ntọala nke abụọ, nkume a na-akpọ safaia, ntọala nke atọ, nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ, nkume a na-akpọ emeralụdụ,
20nke ise, nkume a na-akpọ ọniks, nke isii, nkume a na-akpọ kanelian, nke asaa, nkume a na-akpọ krisolaịt, nke asatọ, nkume a na-akpọ beril, nke itoolu, nkume a na-akpọ topaazi, nke iri, nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu, nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ, nkume a na-akpọ ametisiti.