Mkpughe 21

Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”

Revelation 21:4 (UKJV) And God shall wipe away all tears from their eyes; and there shall be no more death, neither sorrow, nor crying, neither shall there be any more pain: for the former things are passed away.

2Ahụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nʼeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ mara mma dịka nwaagbọghọ ejikwara nke ọma maka ịgakwuru di ya.

3Anụkwara m oke olu si nʼocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nʼetiti ụmụ mmadụ. Ọ ga-ebinyere ha. Ha ga-abụkwa ndị ya, nʼezie, Chineke nʼonwe ya ga-anọkwa nʼetiti ha bụrụkwa Chineke ha.

4Ọ ga-ehichapụ anya mmiri niile dị nʼanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru ụjụ na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị ochie niile agabigala.”

5Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”

6Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.