Mkpughe 21

Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m.

Revelation 21:7 (UKJV) He that overcomes shall inherit all things; and I will be his God, and he shall be my son.

5Onye ahụ nọ nʼocheeze ahụ kwuru sị, “Lee, ana m eme ka ihe niile dị ọhụrụ.” Mgbe ahụ, ọ sịkwara, “Detuo ihe ndị a, nʼihi na okwu ndị a bụ ihe e kwesiri ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”

6Ọ sịrị m, “E mezuola ihe niile. Abụ m Alfa na Omega, Mmalite na Ọgwụgwụ. Aga m enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri nke si nʼisi iyi mmiri nke ndụ dịka ihe onyinye.

7Ndị ọbụla na-emeri emeri ga-enweta ihe nketa ndị a. Aga m abụkwa Chineke ha, ha onwe ha ga-abụ ụmụ m.

8Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.”

9Otu nʼime ndị mmụọ ozi asaa ahụ, nke ji efere asaa ahụ nke ihe ntaramahụhụ dị nʼime ya bịakwutere m sị m, “Soro m, ka m gosi gị nwaagbọghọ ahụ bụ nwunye Nwa Atụrụ ahụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.