17Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọbụla nụrụ okwu a kwuo sị, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa, onye ọbụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ na-akwụghị ụgwọ ọbụla.
18Ana m adọ onye ọbụla nụrụ okwu amụma dị nʼakwụkwọ a aka na ntị, sị, ọ bụrụ na onye ọbụla atụkwasị ihe ọbụla nʼelu ha, Chineke ga-atụkwasịrị onye ahụ ihe ntaramahụhụ ahụ niile e kwuru maka ha nʼakwụkwọ a.
19Ọ bụrụkwa na onye ọbụla ewepụ okwu ọbụla nʼakwụkwọ amụma a, Chineke ga-ewepụ oke o nwere nʼosisi ahụ na-enye ndụ, na oke o nwere nʼobodo nsọ ahụ, nke e kwuru okwu ha nʼakwụkwọ a.
20Onye ahụ gbara ama ihe ndị a niile na-asị, “Nʼezie, ana m abịa ọsịịsọ.” Amen. Bịa, Onyenwe anyị Jisọs.
21Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere ndị nsọ niile. Amen.