1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m hụ ọnụ ụzọ dị nʼeluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa, gbagota nʼebe a, ka m gosi gị ihe ga-emezuriri mgbe ihe ndị a gasịrị.”
2Nʼotu oge ahụ, e mere ka m nọọ nʼime mmụọ, ma lee, ahụrụ m onwe m nʼeluigwe, hụkwa ka e debere otu ocheeze nke otu onye na-anọkwasị nʼelu ya.
3Ụdịdị onye nọkwasịrị nʼocheeze ahụ na-egbu nweghenweghe dịka nkume dị oke ọnụahịa a na-akpọ jaspa na kanelian. Eke na egwurugwu dịka nkume oke ọnụahịa. Emeralụdụ gbara ocheeze ahụ gburugburu.