12Ha na-abụ abụ nʼoke olu na-asị, “O kwesiri bụ Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu ịnara ike na akụnụba na amamihe na ike na nsọpụrụ na otuto na ngọzị.”
13Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ ruo mgbe niile ebighị ebi!”
14Anụ anọ ahụ dị ndụ zakwara sị, “Amen!” Ndị okenye ahụ dakwara nʼala nʼihu ya kpọọ isiala nye ya.