Mkpughe 6

Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara.

Revelation 6:12 (UKJV) And I beheld when he had opened the sixth seal, and, lo, there was a great earthquake; and the sun became black as sackcloth of hair, and the moon became as blood;

10Ha ji oke olu tie mkpu na-asị, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, onye dị nsọ na onye eziokwu, ruo olee mgbe ka ị na-eche ikpe ụwa na ndị bi nʼime ya ikpe ma bọọkwa ọbọ nʼisi ha maka ọbara anyị ha wufuru?”

11E nyere ha nʼotu nʼotu uwe ọcha, a gwakwara ha ka ha zuru ike nwa oge nta, tutu ruo mgbe ọnụọgụgụ ndị ozi ibe ha na ụmụnna ha a ga-egbu dịka e gburu ha ga-ezu.

12Anọkwa m na-ele anya mgbe o meghere akara nke isii ahụ. Nke a mere ka oke ala ọma jijiji dịrị. Anyanwụ gbara ọchịchịrị dị ka akwa mkpe e jiri ajị mee. E mekwara ka ọnwa chaa uhie uhie dịka ọbara.

13Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nʼala dịka mkpụrụ osisi fiig na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efegharị ya.

14Mbara eluigwe gabigara, dịka akwụkwọ mgbe a na-apịakọta ya. Ugwu niile na agwa etiti niile ka e wepụkwara site nʼọnọdụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.