15Ndị eze niile nke ụwa na ndị nọ nʼọchịchị dị iche iche, na ndị ọgaranya, na ndị nọ nʼọnọdụ dị elu, na ndị ọchịagha, na ndị mmadụ niile dị iche iche, ndị ukwu ma ndị nta, ndị ohu na ndị nwe onwe ha, ha niile gara zoo onwe ha nʼime ọgba nkume na nʼokpuru ugwu,
16ha na-eti mkpu na-arịọ ugwu ndị ahụ na-asị, “Dakwasịnụ anyị zoo anyị ka onye ahụ nọkwasịrị nʼelu ocheeze ahụ hapụ ịhụ anyị, ka oke iwe nke Nwa Atụrụ ahụ hapụ ịbịakwasị anyị.
17Nʼihi na, lee oke ụbọchị iwe ha abịala, onye pụrụ ịgbanarị ya?”