Mkpughe 8

Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.”

Revelation 8:13 (UKJV) And I beheld, and heard an angel flying through the midst of heaven, saying with a loud voice, Woe, woe, woe, to the citizens of the earth by reason of the other voices of the trumpet of the three angels, which are yet to sound!

11Aha kpakpando ahụ bụ Ilu ilu. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmiri malitere ilu ilu, ọtụtụ mmadụ nwụrụ nʼihi mmiri a na-elu ilu.

12Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa, otu akụkụ nʼime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nʼime atọ e kere kpakpando niile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nʼuju dịka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị, ọ dịkwa otu a nʼoge anyasị.

13Elere m anya, hụ ma nụkwa otu ugo ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe na-eti mkpu nʼolu ike na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ niile bi nʼụwa nʼihi ụda opi ike nke ndị mmụọ ozi atọ ndị a ga-afụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.