6Mgbe ahụ, ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị ji opi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ.
7Mgbe mmụọ ozi nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara mkpụrụ mmiri na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nʼime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke osisi rechapụrụ ọkụ, e rechapụkwara ahịhịa ndụ niile ọkụ.
8Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwu ọkụ nʼime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere osimiri niile chagharịa ghọọ ọbara.
9Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke ihe niile dị ndụ dị nʼime osimiri nwụrụ. Otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere ụgbọ mmiri niile dị nʼelu osimiri lara nʼiyi.
10Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu nke na-enwu dị ka ọwaọkụ sitere na mbara eluigwe danye nʼime otu ụzọ nʼime ụzọ atọ e kere iyi niile na isi iyi niile.