Mkpughe 9

Ndị agha ahụ, ọnụọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị.

Revelation 9:16 (UKJV) And the number of the army of the horsemen were two hundred thousand thousand: and I heard the number of them.

14na-agwa mmụọ ozi nke isii ahụ, nke ji opi ike okwu, “Tọpụ mmụọ ozi anọ ndị ahụ e kere agbụ nʼebe osimiri Yufretis dị.”

15A tọhapụrụ ndị mmụọ ozi anọ ahụ, ndị e jibu eji na njikere maka oge awa ahụ, na ụbọchị ahụ, na ọnwa ahụ, na afọ ahụ, iji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ.

16Ndị agha ahụ, ọnụọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị.

17Nʼime ọhụ m, ahụrụ m ịnyịnya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nʼelu. Ndị nọ nʼelu ịnyịnya ndị a yi ihe ikpuchi obi nke ụfọdụ nʼime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dịka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dịka anwụrụ ọkụ. Isi ịnyịnya ha dịka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ sị ha nʼọnụ na-apụta.

18E sitere nʼihe mmekpa ahụ ndị a, ire ọkụ, anwụrụ ọkụ na nkume ọkụ na-adịghị anyụ anyụ, ka ha ji gbuo otu ụzọ nʼime ụzọ atọ nke mmadụ niile bi nʼụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.