Mkpughe 9

Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe.

Revelation 9:2 (UKJV) And he opened the bottomless pit; and there arose a smoke out of the pit, as the smoke of a great furnace; and the sun and the air were darkened by reason of the smoke of the pit.

1Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ.

2Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe.

3Igurube sitere nʼanwụrụ ọkụ ahụ pụta fedakwasa ụwa. E nyekwara ha ike ịta mmadụ ọbụla dịka akpị si agba mmadụ.

4E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọbụla, maọbụ osisi na ihe ọbụla a kụrụ nʼala. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọbụla na-enweghị akara Chineke nʼegedege ihu ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.