Ndị Rom 1

Nʼekpere m oge niile, a na m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nʼike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu.

Romans 1:10 (UKJV) Making request, if by any means now at length I might have a prosperous journey by the will of God to come unto you.

8Na mbụ, ana m ekele Chineke ekele nʼihi unu niile, site nʼaha Jisọs Kraịst. Nʼihi na a na-ekwusa ihe banyere okwukwe unu nʼụwa niile.

9Chineke, onye m na-ejere ozi, nʼime mmụọ site na ikwusa oziọma nke Ọkpara ya, bụ onye akaebe na m na-echeta unu mgbe niile nʼekpere m.

10Nʼekpere m oge niile, a na m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nʼike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu.

11Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nʼihi na achọrọ m ka unu keta oke nʼonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzosi ike nʼokwukwe.

12Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.