12Ọ bụkwaghị naanị nke a, kama achọrọ m ka anyị gbarịtaa onwe anyị ume site nʼokwukwe anyị.
13Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata na atụọla m atụmatụ ịbịa leta unu ọtụtụ mgbe (ma tutu ruo ugbu a e gbochiri m ịbịa), ka m nwee ike nweta mkpụrụ nʼetiti unu, dịka m nwere nʼetiti ndị mba ọzọ.
14Nʼihi na abụ m onye ji ụgwọ nye ndị Griik na ndị mba ọzọ, nyekwa ndị maara ihe na ndị nzuzu.
15Ya mere m ji dị njikere ikwusa oziọma nyekwa unu bụ ndị bi na Rom.
16Nʼihi na ihere oziọma ahụ anaghị eme m, nʼihi na ọ bụ ike Chineke na-ewetara onye ọbụla kwere na ya nzọpụta, nye onye Juu na mbụ nakwa nye onye Griik.