Ndị Rom 1

Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya.

Romans 1:19 (UKJV) Because that which may be known of God is manifest in them; for God has showed it unto them.

17Nʼihi na ọ bụ nʼoziọma ka e kpughere ezi omume Chineke, ezi omume nke na-esite nʼokwukwe ruo okwukwe. Dịka e siri dee ya, “Onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe dị ndụ.”

18Nʼihi na e sitela nʼeluigwe kpughe ọnụma Chineke megide mmehie na ajọ omume niile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nʼajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ.

19Nʼihi na ndị a maara ihe ha kwesiri ịmata banyere Chineke. Ha maara ya nʼihi na Chineke nʼonwe ya emeela ka o doo ha anya.

20Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ.

21Ọ bụ eziokwu na ha maara Chineke, ma ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye ya ekele dịka Chineke. Echiche uche ha bụ ihe efu, nzuzu ha mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.