Ndị Rom 1

Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ.

Romans 1:2 (UKJV) (Which he had promised before by his prophets in the holy scriptures,)

1Pọl, odibo Kraịst Jisọs, onye Chineke kpọrọ ka ọ bụrụ onyeozi ya na onye o kewapụtara ka o zisaa oziọma ya.

2Oziọma a bụ nke ahụ Chineke kwere na nkwa nʼoge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya nke e dere ihe banyere ya nʼakwụkwọ nsọ.

3Oziọma a metụtara Ọkpara ya, onye bụ nwa Devid site nʼọmụmụ nke anụ ahụ.

4Onye esitere na Mmụọ nke ịdị nsọ họpụta ị bụ Ọkpara Chineke, site nʼike nke mbilite nʼọnwụ, bụ Kraịst Jisọs, Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.