Ndị Rom 1

Ha bụkwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị okwukwe, ndị obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere.

Romans 1:31 (UKJV) Without understanding, covenant-breakers, without natural affection, refusing to reconcile, unmerciful:

29Ha jupụtara nʼajọ omume na mmehie niile, anya ukwu na aghụghọ. Ha jupụtakwara nʼekworo, na igbu mmadụ, na esemokwu, na uche gbagọrọ agbagọ na ịkpọ asị. Ha bụ ndị na-ekwu okwu azụ,

30na ndị nkwutọ na ndị kpọrọ Chineke asị, na ndị na-akparị mmadụ na ndị mpako na ndị na-anya isi. Ha na-atụpụta ụzọ ọhụrụ ime ihe ọjọọ, ha adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha.

31Ha bụkwa ndị na-enweghị nghọta, ndị na-enweghị okwukwe, ndị obi ọjọọ na ndị na-enweghị obi ebere.

32Ha maa na Chineke nyere iwu dị ike na ndị na-ebi ndụ dị otu a kwesiri ọnwụ, ma ha gara nʼihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalịkwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.