5Onye anyị sitere nʼaka ya nata amara na ọrụ ị bụ onyeozi, ime ka ndị mba ọzọ nwee nrube isi nke okwukwe nʼetiti ha nʼihi aha ya.
6Tinyere unu onwe unu ndị ahụ a kpọrọ ka ha bụrụ ndị nke Jisọs Kraịst.
7Ya bụ, unu ndị Chineke hụrụ nʼanya bi na Rom, ndị ọ kpọrọ ka ha bụrụ ndị nsọ: Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
8Na mbụ, ana m ekele Chineke ekele nʼihi unu niile, site nʼaha Jisọs Kraịst. Nʼihi na a na-ekwusa ihe banyere okwukwe unu nʼụwa niile.
9Chineke, onye m na-ejere ozi, nʼime mmụọ site na ikwusa oziọma nke Ọkpara ya, bụ onye akaebe na m na-echeta unu mgbe niile nʼekpere m.