Ndị Rom 10

Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke.

Romans 10:2 (UKJV) For I bear them record that they have a zeal of God, but not according to knowledge.

1Ụmụnna m, ihe na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwu na ekpere m na-ekpe nye Chineke bụ ịhụ na a zọpụtara ha.

2Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nʼobi nke ukwuu. Kama ịnụ ọkụ nʼobi ha abụghị site na mmazu Chineke.

3Ebe ha na-amaghị ezi omume nke si na Chineke bịa kama ha chọrọ ihiwe nke onwe ha, ha ewedaghị onwe ha nʼokpuru ezi omume nke Chineke.

4Kraịst bụ ọgwụgwụ iwu. Ya mere, ezi omume ga-adịrị onye ọbụla nke kwere.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.