11Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile.
12Nweenụ obi aṅụrị nʼime olileanya, nweenụ ntachiobi nʼime nsogbu, na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile.
13Na enyetụnụ ụfọdụ ndị nsọ ihe site nʼihe unu nwere iji gboo mkpa dịrị ha. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa anya nke ọma.
14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
15Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.