14Gọzienụ ndị na-akpagbu unu, gọzienụ ha, unu abụkwala ha ọnụ.
15Mgbe ndị ọzọ na-aṅụrị ọṅụ, soronụ ha ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ha nọ nʼiru ụjụ, soronụ ha ruo ụjụ.
16Na-ebinụ nʼudo. A bụla onye mpako, unu na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe niile.
17Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị. Kama, na-echenụ otu unu ga-esi mee ihe dị mma nʼanya mmadụ niile.
18Dịka ike gị niile ha, mee ka gị na onye ọbụla biri nʼudo.