19Ndị enyi m, unu abọla ọbọ, kama hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọtara unu ọbọ. Nʼihi na e dere ya, “Ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi,” ka Onyenwe anyị kwuru.
20Ma otu ọ dị, “ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, were nri zụọ ya, ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ihe ọṅụṅụ ka ọ ṅụọ, mgbe ị na-eme nke a, ị na-agụkwasị icheku ọkụ na-ere ere nʼisi ya.”
21Unu ekwela ka ihe ọjọọ merie unu, kama werenụ ezi ihe merie ihe ọjọọ.