Ndị Rom 12

Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike.

Romans 12:9 (UKJV) Let love be without dissimulation. Detest that which is evil; cleave to that which is good.

7Ọ bụrụ ije ozi, ya jee ozi, ya bụrụkwanụ izi ihe, ya zie ihe.

8Ka onye nwere onyinye ịgbaume, gbaa ndị ọzọ ume, ya bụrụkwanụ inyeaka, ka onye nwere onyinye a site nʼafọ ofufu mee ya, ọ bụrụ ịbụ onyendu, ka onye ahụ duo site nʼikpachapụ anya, ya bụrụkwanụ ime ebere, ka onye ahụ jiri obi ụtọ na-eme ya.

9Ka ịhụnanya bụrụ nke ihu abụọ nʼadịghị na ya, kpọọ ihe ọjọọ asị, jidesie ihe dị mma ike.

10Hụrịtanụ onwe unu nʼanya, dịka ụmụ nke otu nna. Ka ihe ibe unu na-eme na-atọ unu ụtọ. Na-asọpụkwaranụ ibe unu karịa otu ha si asọpụrụ unu.

11Unu abụla ndị umengwụ nʼọrụ unu. Kama werenụ mmụọ na obi na-anụ ọkụ na-ejere Onyenwe anyị ozi mgbe niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.