15Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nʼanya. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe ga-ewetara nwanna gị ịla nʼiyi, nʼihi na cheta na ọ bụkwa nʼihi ya ka Kraịst jiri bịa nwụọ.
16Ekwela ka ihe ọma gị bụrụ nke a ga-akpọ ajọọ ihe.
17Nʼihi na alaeze Chineke abụghị oriri na ọṅụṅụ kama ọ bụ ezi omume, na udo na ọṅụ nʼime Mmụọ Nsọ.
18Nʼihi na onye ọbụla na-efe Kraịst nʼụzọ dị otu a, na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, ụmụ mmadụ na-anabatakwa ya.
19Ka ihe na-agụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe ga-eweta udo, ya na ime ihe nʼụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu.