20Emebikwala ọrụ Chineke nʼihi nri; nri niile dị ọcha, ma o kwesighị ka onye ọbụla rie ihe ga-eme ka onye ọzọ sụọ ngọngọ.
21Ọ ga-akara gị mma ka ị hapụ iri anụ maọbụ ịṅụ mmanya ma ọ bụkwanụ ime ihe ọbụla ga-eme ka nwanna gị sụọ ngọngọ.
22Ya mere, ka okwukwe i nwere banyere ihe ndị a bụrụ nke dị nʼetiti gị na Chineke. Ngọzị na-adịrị onye ọbụla nke na-adịghị ama onwe ya ikpe site nʼihe ọ nabatara.
23Ma onye ọbụla na-eri ihe ọbụla site nʼobi abụọ bụ onye ikpe mara, nʼihi na ọ jighị okwukwe rie ya, nʼihi na ihe ọbụla a na-esiteghị nʼokwukwe mee bụ mmehie.