1Nabatanụ ndị okwukwe ha na-esighị ike nʼetiti unu. Ma ọ bụghị nʼihi ise okwu banyere ihe ntule nke obi.
2Otu onye nwere okwukwe iri ihe niile, ma onye na-adịghị ike nʼokwukwe, na-eri naanị ahịhịa nri.
3Onye ahụ na-eri ihe niile e kwesighị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ nke nʼadịghị eri ihe niile ekwesighị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nʼihi na Chineke anabatala onye ahụ.
4Onye ka ị bụ i ji na-ekpe odibo onye ọzọ ikpe? Onye ọ dịrị ikpebi ma odibo ya ọ na-emezi emezi ma ọ dịghị emezi bụ nna ya ukwu. Ma odibo ahụ aghaghị iguzosi ike nʼihi na Onyenwe anyị pụrụ ime ka o guzosie ike.
5Otu onye nwere ike na-eche na otu ụbọchị kacha ndị ọzọ na ịdị nsọ, onye nke ọzọ nwekwara ike na-eche na ụbọchị niile bụ otu ihe, ma o kwesiri ka onye ọbụla kpebiere onwe ya.